Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 4:27 - Bible Nso

27 Ma ọ buru na otù madu n'etiti ndi ala emehie n'amaghi-ama, n'ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 “ ‘Ọ bụrụ na otu onye nʼetiti ndị obodo ahụ emehie na-amaghị ama, mee ihe megidere ihe ọbụla Onyenwe anyị nyere nʼiwu nke a na-adịghị eme eme, mgbe ha ghọtara ikpe ọmụma ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 4:27
14 Iomraidhean Croise  

B͕ochi kwa orù-Gi na nmehie-nganga; Ekwela ka ha nāchim: mb͕e ahu ka m'gēzu okè, Agāgukwam n'onye ikpe njehie riri nne nāmaghi.


Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu.


Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.


Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.


Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha;


Gwa umu Israel okwu, si, Mb͕e madu gēmehie n'amaghi-ama megide ihe ọ bula nime ihe Jehova nyere n'iwu, si, Emela ha; ọ we me otù nime ha:


Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n'amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;


Ma ọ buru si na madu emehie, me ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme; ọ bu ezie na ọ maghi, ma ikpe mara ya, o gēbu kwa ajọ omume-ya.


Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.


Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu.


Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n'amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n'iwu, nke Jehova gwaworo Moses,


Ma ọ buru na otù onye emehie n'amaghi-ama, ọ gēweta kwa nso nne-ewu nke b͕ara otù arọ iji chu àjà-nmehie.


Ma onye amuru n'ala n'etiti umu Israel, ma ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, otù iwu ka unu gēnwe bayere onye nēme ihe n'amaghi-ama.


Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ha gēme ihe nime nmehie nile nke madu, imekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ikpe ewe ma nkpuru-obi ahu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan