Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 4:21 - Bible Nso

21 O gēbupu kwa oke-ehi ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, sure ya ọku dika o surere oke-ehi mbu: àjà-nmehie nke nkpọkọta Israel ka ọ bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Emesịa, onye nchụaja ga-eburu ozu oke ehi ahụ gaa nʼazụ obodo kpọọ ya ọkụ nʼebe ahụ, dịka o mere oke ehi nke mbụ. Nke a bụ aja mmehie nʼihi nzukọ Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 4:21
18 Iomraidhean Croise  

Ndi nēsi na ndọta-n'agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n'ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova.


Ma anu oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na nsi-ya, i gēsure ya n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū-unu: àjà-nmehie ka ọ bu.


Onye-isi gēdozi kwa n'ubọchi ahu otù oke-ehi n'ọnọdu onwe-ya na n'ọnọdu ndi nile nke ala nka, ibu àjà-nmehie.


Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie:


Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere:


Oke-ehi àjà-nmehie ahu kwa, na nkpi àjà-nmehie ahu, nke ewebatara ọbara-ha ikpuchi nmehie n'ebe nsọ a, agēbupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ha gēsure kwa akpukpọ-ha na anu-ha na nsi-ha nime ọku.


Ma ọ buru na nzukọ nile nke Israel eme ihe n'amaghi-ama, ewe zopu ihe ahu n'anya nkpọkọta Israel, ọ buru kwa na ha emewo ihe megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ha;


Ọ gēme kwa oke-ehi ahu dika ọ mere oke-ehi nke àjà-nmehie, otú a ka ọ gēme ya: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ha nmehie-ha, agāb͕aghara kwa ha ya.


O gēyipu uwe-ya, yiri uwe ọzọ, bupu ntu ahu je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, rue ebe di ọcha.


Onyinye-inata-iru-ọma ọ bula nke onye-nchu-àjà ka agēsuresi kwa oku: agaghi-eri ya.


Ma oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na anu-ya, na nsi-ya, o surere ha n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū; dika Jehova nyere Moses iwu.


ọ gēru kwa, ma ọ buru na emewo ya n'amaghi-ama, n'ebe anya nzukọ Israel nērughi, na nzukọ ahu nile gēme otù nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ibu ihe ísì utọ anēsurere Jehova, ya na onyinye-inata-iru-ọma-ya, na àjà-Ihe-ọṅuṅu-ya, dika ikpé-ya si di, na otù nkpi iji chu àjà-nmehie.


dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


N'ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n'ebe nsọ site n'aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan