Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 3:6 - Bible Nso

6 Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n'ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 3:6
16 Iomraidhean Croise  

Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n'ebe-ichu-àjàm dika ihe nātọ utọ, M'gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso sitere n'ìgwè ewu na aturu, site n'aturu, ma-ọbu site n'ewu, bú nke ọ nēweta nso ibu àjà-nsure-ọku; oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n'etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n'etiti anu-ulo, n'etiti ìgwè ehi na n'etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso.


Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.


Ihe ọ bula nke ọlu di n'aru ya, unu ewetala ya nso: n'ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.


Unu gēme kwa otù nkpi ka ọ buru àjà-nmehie, me kwa umu-ebulu abua nke b͕ara otù arọ ka ha buru ihe àjà nke àjà-udo.


manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ anọ nke hin, tiyere àjà-nsure-ọku ahu, ma-ọbu iji chu àjà ọzọ ahu, ka i gēdoziri otù nwa-aturu.


ọ gēweta kwa nso Jehova onyinye-ya iji biaru nso, otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, na otù nwa-nne-aturu nke b͕ara otù arọ, nke zu-kwa-ra okè, ka ọ buru àjà-nmehie, na otù ebulu zuru okè ka ọ buru àjà-udo,


n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,


Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.


ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu,


rue ọchichi-èzi-na-ulo nke ozuzù oge akara àkà, ichikọta ihe nile nime Kraist-ayi dika Isi, bú ihe nile di n'elu-igwe, na ihe nile di n'elu uwa; nime Ya, ka m'kwuru,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan