Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 3:16 - Bible Nso

16 Onye-nchu-àjà gēsure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: ọ bu nri àjà-ọku, ka ọ buru ihe ísì utọ: abuba nile bu ihe Jehova nwere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 3:16
19 Iomraidhean Croise  

Ebel kwa, ya onwe-ya wetakwara ufọdu nime umu eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu ya, na ufọdu nime iberibe-ha mara abuba. Jehova we le Ebel, le kwa onyinye-inata-iru-ọma-ya, anya ọma:


Ọzọ kwa, àjà-nsure-ọku bara uba, tiyere abuba nke àjà-udo nile, tiye-kwa-ra àjà-ihe-ọṅuṅu nile nke diri àjà-nsure-ọku. Ewe dozie òfùfè ulo Jehova.


Solomon we do etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke Solomon mere apughi inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba ahu.


I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n'imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.


I gēsi kwa n'ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n'elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n'ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu:


Ma ọ tọrọ Jehova utọ izọpia ya; O mewo ka ọ ria ọria: ọ buru na nkpuru-obi-ya achu àjà-ikpe-ọmuma, ọ gahu nkpuru-ya, me ka ubọchi-ya nile di ogologo, ihe nke nātọ Jehova utọ gāga kwa nke-ọma n'aka-ya.


Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n'ebe M'nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n'irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta:


Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.


Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n'elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.


Ọ were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nile nke di n'elu ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba-ha, na utaku-ukwu aka-nri ya:


Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.


Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan