Levitikọs 27:30 - Bible Nso30 Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a30 “ ‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke Onyenwe anyị. Ha bụ ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị. Faic an caibideil |
Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.