Ndi-Ju fọduru ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze kpọkọta-kwa-ra onwe-ha, we guzo n'ihi ndu-ha, zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha, b͕ue orú nnù ndikom uzọ iteghete na nnù asa na ọgu iri n'etiti ndi nākpọ ha asì; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.
Ma ndi nāfọdu n'etiti unu, M'gēme ka ida-mbà ba n'obi-ha n'ala ndi-iro-ha: olu nke akwukwọ-osisi ifufe nēfepu gāchu kwa ha; ha gāb͕alaga nb͕alaga mma-agha; ha gāda kwa mb͕e ọ dighi onye nāchu ha.
M'gēnye udo n'ala, unu gēdina kwa ala, ọ dighi kwa onye ganēme ka unu ma jijiji: M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala, mma-agha agaghi-agabiga kwa n'ala-unu.
Madu ise n'etiti unu gāchu ọgu madu ise, ọgu madu ise n'etiti unu gāchu kwa orú nnù madu na nnù madu ise: ndi-iro-unu gāda kwa n'iru unu site na mma-agha.
Òtù onye gēsi aṅa chu nnù madu abua na ọgu iri, Màdu abua gēsi kwa aṅa me ka orú nnù madu na nnù madu ise b͕alaga, Ma ọ buru na Oké Nkume-ha ereghi ha, Ọ buru kwa na Jehova emechibidoghi ha uzọ?
Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.
Jonatan we bikwasi aka-ya na ukwu-ya rigo, onye nēbu ihe-agha-ya nēso kwa ya n'azu: ha we da n'iru Jonatan; onye nēbu ihe-agha-ya nēme kwa ka ha nwua n'azu ya.