Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 26:4 - Bible Nso

4 M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 aga m enye unu mmiri ozuzo nʼoge ya, nke ga-eme ka ala unu mịa ọtụtụ ihe ubi. Osisi unu niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ mgbe niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 26:4
31 Iomraidhean Croise  

Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala, Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:


I bu Onye nēsi n'ime-ulo-elu-Ya nile dè ugwu nile miri: Afọ nēju uwa site na nkpuru nke ọlu-Gi nile.


Ala emewo ihe-ọmume-ya: Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.


Chineke gāgọzi ayi; Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.


Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke, Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike.


Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe; Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.


Ezi omume gāga n'iru Ya; Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ.


Ọ gēnye kwa míri-ozuzo nke nkpuru-ọghigha-gi, nke i gāgha n'ala-ubi-gi; na achicha nke ihe-omume nke ala-ubi, ọ gāma kwa abuba, ba uba: n'ubọchi ahu anu-ulo-gi nile gāta nri n'ebe-íta-nri sara mbara.


m'gēme kwa ka ọ gwusia; agaghi-akwacha vine-ya, agaghi-edozi kwa ya; ma ogwu na uke gētoputa: igwe-oji nile ka m'gēnye kwa iwu ka ha ghara izokwasi ya miri.


Ọ̀ di ihe ọ bula n'etiti ihe-efu nile nke mba nile nke nēme ka miri zo? ma-ọbu elu-igwe, hà gēnye oké miri-ozuzo? ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Onye ahu, Jehova, bú Chineke-ayi? ayi gēle kwa anya Gi; n'ihi na Gi onwe-gi emewo ihe ndia nile.


M'gēme kwa ka nkpuru osisi na ihe-omume nke ubi ba uba, ka unu we ghara inara kwa ita-uta nke oké unwu n'etiti mba nile ọzọ.


Unu atula egwu, unu anu ọhia; n'ihi na ebe-ita-nri nile nke ọzara nēpuputa ahihia ndu, n'ihi na osisi nāmi nkpuru-ya, osisi fig na osisi vine nāmi nkpuru ka ike-ha ra.


Ala ahu gāmi nkpuru-ya, unu gēriju afọ, biri nime ya na ntukwasi-obi.


M'gēnye kwa ngọzim iwu idakwasi unu n'arọ nke-isi, ọ gēme-kwa-ra arọ atọ ahu ihe-ọmume.


N'ihi na nkpuru udo gādi; osisi vine gāmi nkpuru-ya, ala ēme kwa ihe-ọmume-ya, elu-igwe gēnye igirigi-ha; M'gēme kwa ka ndi nka fọduru keta ihe ndia nile.


ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.


Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.


O gēru kwa, ọ buru na unu ejisie ike ige nti ihem nile enyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya, na iwere obi-unu nile na nkpuru-obi-unu nile fè Ya òfùfè,


na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.


Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe.


Ya mere, umu-nnam, nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayi. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n'ebe ọ di, rue mb͕e ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu.


Ndia nwere ike imechi elu-igwe, ka miri we ghara izo n'ubọchi nile nke amuma-ha: ha nwe-kwa-ra ike n'ebe miri nile di, ime ka ha b͕anwè ọbara, na iwere ihe-otiti nile ọ bula tie uwa, ka mb͕e ha gāchọ ra.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan