Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 26:34 - Bible Nso

34 Mb͕e ahu ka ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ ala ahu utọ ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu, mb͕e unu onwe unu nọ kwa n'ala ndi-iro-unu; mb͕e ahu ka ala gākwusi n'ọlu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Mgbe ahụ, ala ahụ ga-ezu ike, ogologo oge ndị ahụ niile ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Mgbe unu ga-anọ dịka ndị ohu nʼala ndị iro unu. Ala ahụ ga-ezu ike, imejupụta afọ izuike ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 26:34
7 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala onye-iro, n'ebe di anya ma-ọbu n'ebe di nso;


imezu okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia, rue mb͕e ubọchi-izu-ike-ya nile tọsiri ala ahu utọ: ubọchi nile nke ntọb͕ọrọ-n'efu-ya ọ kwusiri ọlu, imezu ọgu arọ atọ na iri.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya.


Ubọchi nile nke itọb͕ọ-n'efu ahu ka ọ gākwusi n'ọlu: nke ọ nākwusighi n'ubọchi-izu-ike-unu, mb͕e unu biri n'elu ya.


Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan