Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 26:33 - Bible Nso

33 Unu ka M'gēfesa kwa n'etiti mba nile, M'gāmipu kwa mma-agha chua unu n'azu: ala-unu gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, obodo-unu nile gābu kwa nkpọnkpọ ebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Aga m achụsa unu na mba niile, mịpụta mma agha m jiri ya chụso unu ọsọ. Ala unu ga-atọgbọrọ nʼefu, a ga-etikpọkwa obodo unu niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 26:33
34 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ha gēmehie megide Gi, (n'ihi na ọ dighi madu ọ bula nke nādighi-emehie,) I we wesa ha iwe, rara ha nye n'iru onye-iro-ha, ndi nādọta ha n'agha ewe dọta ha n'agha je n'ala onye-iro, n'ebe di anya ma-ọbu n'ebe di nso;


o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.


Ma ọ buru na unu onwe-unu alaghachi azu, we rapu ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, nke M'tiyeworo n'iru unu, unu we je fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha:


Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.


Biko, cheta okwu ahu nke I nyere Moses, bú orù-Gi, n'iwu, si, Asi na unu onwe-unu emekpu emekpu, Mu onwem gēme ka unu b͕asa n'etiti ndi nile:


Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.


Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile.


I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri; N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.


I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia, I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha.


Ala-unu bu ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-unu, esurewo ha n'ọku; ala-ubi-unu, n'iru unu ka ndi ala ọzọ nēri ya, ọ bu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, dika nkwatu ndi ala ọzọ.


M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,


M'gāchusa kwa ha, dika ahihia-ọka kpọrọ nku nke nāgabiga, nye ifufe ọzara.


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


Nurunu okwu Jehova, unu mba nile, gosi-kwa-nu ya n'agwe-etiti nile di n'ebe di anya; si-kwa-nu, Onye nēfesa Israel gāchikọta ya, debe kwa ya, dika onye-ọzùzù-aturu si emere ìgwè aturu-ya.


Ọdum esiwo n'alughi-ulù-ya rigo, bú onye nēbibi mba di iche iche; o buliwo ije-ya, o siwo n'ọnọdu-ya puta; ime ka ala-gi ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu; obodo-gi nile gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.


Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.


M'gāchusa kwa ha n'etiti mba nile, ndi ha nāmaghi, ma ha onwe-ha ma ndi bu nna-ha: M'gēziso ha mma-agha, rue mb͕e M'mere ka ha gwusia.


Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.


Juda ejewo ibiri n'ala ọzọ site na nweda-n'ala, na site n'iba-uba nke ọbubu-orù; Ya onwe-ya ebiriwo n'etiti mba nile, ọ chọtaghi izu-ike: Ndi nile ndi nāchu ya chukuru ya n'ebe di nkpà.


Wezuganu onwe-unu, ka ha kpọrọ ha òkù, Onye ruru árú! wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, unu emetula aka: Mb͕e ha b͕apuru ha ṅaghari-kwa-ra; madu siri n'etiti mba nile, Ha agaghi-anọ kwa ọnọdu-abali ọzọ n'ebe a.


Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ: Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.


Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Mu onwem weli-kwa-ra ha akam n'ọzara, si, na M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile;


M'gāchusa kwa gi n'etiti mba nile, fesa kwa gi n'ala nile; M'gēme kwa ka iru-árú-gi si nime gi gwusia.


Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.


N'ihi na, le, ha esiwo na nbibi la, ma Ijipt gāchikọta ha, Memfis gēlì ha: ihe ọla-ọcha ha anāchọsi ike, akuba gēnweta ha: ogwu gādi n'ulo-ikwū nile ha.


Ọ buru kwa na ha ala nime ndọta-n'agha n'iru ndi-iro-ha, site n'ebe ahu ka M'gēnye mma-agha iwu, o we b͕ue ha: M'gātukwasi kwa ha anyam abua ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha ezi ihe.


ma M'gēfesa ha dika oké ifufe n'etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n'efu n'azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n'ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.


Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.


Jemes, orù nke Chineke na nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ebo-ayi iri na abua ndi nọ na Nb͕asa ahu, nēkele unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan