Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 25:5 - Bible Nso

5 Ewela ihe-ubi-gi nke nēpu n'onwe-ya, aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine gi nke anākwachaghi akwacha: arọ nke idebe-ubọchi-izu-ike ka ọ gāburu ala ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 25:5
5 Iomraidhean Croise  

Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpu n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-atọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.


Ma nka gāburu gi ihe-iriba-ama: unu gēri n'arọ a ihe nēpú n'onwe-ya, na n'arọ nke-abua ihe si na nke ahu pue; ma n'arọ nke-otọ ghanu nkpuru, we kwa ihe ubi, ku kwa vine n'ubi-vine, ri kwa nkpuru-ha.


Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha.


ma n'arọ nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike gādiri ala ahu, bú ubọchi-izu-ike agēdebere Jehova: aghala nkpuru n'ubi-gi, akwacha-kwa-la osisi ubi-vine-gi.


Ubọchi-izu-ike nke ala ahu gābu-kwa-ra unu ihe-oriri; ọ gāburu gi, buru kwa orù-gi nwoke, buru kwa orù-gi nwayi, buru kwa onye i goro ọlu, buru kwa onye nānọdu n'ulo-gi, bú ndi nọyere gi dika ọbìa;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan