Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 25:48 - Bible Nso

48 mb͕e eresiri ya, nb͕aputa diri ya; otù onye nke sitere n'umu-nne-ya gāb͕aputa ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

48 ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 25:48
9 Iomraidhean Croise  

Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù.


Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.


M'we si ha, Ayi onwe-ayi ab͕aputawo umu-nne-ayi, bú ndi-Ju, ndi erenyere ndi mba ọzọ, dika aka-ayi ruru; ùnu onwe-unu gēre kwa umu-nne-unu, àgērenye kwa ayi ha? Ha we b͕a nkiti, ha ahughi kwa okwu ha gāza.


Mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, we re ufọdu nime ihe-onwunwe-ya, onye-nb͕aputa-ya nke bu onye-aru-ya gābia kwa, b͕aputa ihe nwa-nne-ya reworo.


Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye, aka-ya ewe ghara idi ike n'ebe-obibi-gi; i gēye-kwa-ra ya aka: dika ọbìa na onye-nnọdu ka ọ gābu, o gēbiyere kwa gi.


Ọzọ, mb͕e aka ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-unu gēru inwe àkù, ma nwa-nne-gi adawo ob͕eye n'akuku-ya, were onwe-ya renye ọbìa ma-ọbu onye-nnọdu n'ala-gi, ma-ọbu were onwe-ya renye onye bayere nkpọrọgwu n'ab͕uru ọbìa:


ma-ọbu nwa-nne nna-ya, ma-ọbu nwa nwa-nne nna-ya, gāb͕aputa ya; ma-ọbu onye-aru-ya site n'ab͕uru-ya gab͕aputa ya; ma ọ buru na aka-ya erue inwe àkù, ọ gāb͕aputa onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan