Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 25:39 - Bible Nso

39 Ọzọ, mb͕e nwa-nne-gi gāda ob͕eye n'ebe-obibi-gi, we renye gi onwe-ya; emela ka ọ fè òfùfè nke orù:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 “ ‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 25:39
16 Iomraidhean Croise  

Ma ọ dighi orù Solomon mere site n'umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.


Ma otù nwayi n'etiti ndinyom umu ndi-amuma tikuru Elaisha nkpu, si, Orù-gi, bú dim, anwuwo: ma gi onwe-gi amawo na orù-gi nātu egwu Jehova: ma onye-nbinye-ego abiawo ichiri n'onwe-ya umum abua ka ha buru orù.


Ma ub͕u a unu onwe-unu nāsi na unu gāzọda umu Juda na Jerusalem ka ha ghọrọ unu ndi-orù na ndinyom nēje ozi: ma unu onwe-unu, ìhe ikpe-ọmuma adighi kwa n'etiti unu n'ebe Jehova, bú Chineke-unu, nọ?


Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.


ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.


Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu.


Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.


N'ihi na ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ha fè ha òfùfè, ọbuná ha onwe-ha: M'gākwughachi kwa dika omume nile ha si di, na dika ọlu nke aka-ha si di.


Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gāb͕ajipu yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibì; ndi ala ọzọ agaghi-eme kwa ka ọ fè ha òfùfè ọzọ:


N'ọgwugwu arọ asa unu gēzilaga, onye ọ bula nwa-nne-ya, bú onye-Hibru, nke rere onwe-ya n'aka-gi, we fè gi arọ isi, i gēzilaga ya inwere onwe-ya: ma nna-unu-hà egeghm nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala.


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;


na ha nile gēzilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, nke bu nwoke Hibru ma-ọbu nwanyi Hibru, inwere onwe-ya; ka madu we ghara ime ka ha fè ya òfùfè-orù, onye ọ bula o me ka onye-Ju, bú nwa-nne-ya, fè ya:


Unu gēme ha ka ha buru ihe-nketa umu-unu ndi gānochi unu gēnwe, inweta dika-onwunwe; rue mb͕e ebighi-ebi ufọdu nime ndi ahu ka unu gēme ka ha buru orú-unu: ma unu ewela nkpab͕u zọda umu-nne-unu, bú umu Israel, nāzọdarita onwe-unu n'otù n'otù.


Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan