Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 25:36 - Bible Nso

36 Anarala ya uma ma-ọbu ọmuru-nwa; ma tua egwu Chineke-gi: ka nwa-nne-gi we biyere gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 25:36
16 Iomraidhean Croise  

Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke.


Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n'ibé: kwe ka ayi nara ọka, n'ihi oké unwu a.


Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.


Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.


Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.


O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma.


Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.


n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.


o siwo n'aru onye ewedara n'ala seghachi aka-ya, uma na ọmuru-nwa ka ọ nānaraghi, ikpém nile ka o meworo, n'ukpurum nile ka o jeghariworo; onye ahu agaghi-anwu n'ihi ajọ omume nke nna-ya, ọ ghaghi idi ndu.


nke nādighēnye ego ka ọ nara uma, nke nādighi-anara ọmuru-nwa, nke nēsi n'ajọ omume seghachi aka-ya, nke nēme ihe ekpere n'ezi-okwu n'etiti madu na madu,


Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Unu emerita-kwa-la onwe-unu ihe-ike; ma i gātu egwu Chineke-gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi.


Enyela ya ego-gi n'uma, enye-kwa-la ya ihe-oriri-gi n'ọmuru-nwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan