N'ihi na onye nēre ere agaghi-alaghachikute ihe erere, ọ bu ezie na ndu-ha nādi kwa n'etiti ndi di ndu: n'ihi na ọhù ahu diri ìgwè madu-ya nile, ọ gaghi-alaghachi; ọ dighi kwa onye ọ bula gēji ajọ omume nke ndu-ya me onwe-ya ka ọ di ike.
Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya.
Ma mb͕e aka-ya achọtaghi ihe gēzu inweghachi ya n'onwe-ya, ihe ọ reworo gādi kwa n'aka onye zuworo ya rue arọ jubile: ma na jubile ahu ọ gāpu, ọ gālaghachi kwa n'ihe-onwunwe-ya.
Ọ buru kwa na ọ bu jubile nke umu Israel, agātukwasi kwa ihe-nketa-ha n'ihe-nketa nke ebo ahu nke gēnwe ha: ewe gupu ihe-nketa-ha n'ihe-nketa ebo nna-ayi-hà.