Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 25:10 - Bible Nso

10 Unu gēdo kwa arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu nsọ, kpọsa kwa n'ala ahu nile si na ndi nile bi nime ya nwere onwe-ha: jubile ka arọ ahu gāburu unu; unu gālaghachi kwa, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya, laghachi kwa, onye ọ bula n'ab͕uru-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 25:10
30 Iomraidhean Croise  

Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Chineke-ya nọyere ya, ya rigoru kwa Jerusalem, wue ulo Jehova, bú Chineke Israel, (Ya onwe-ya bu Chineke,) nke di na Jerusalem.


Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe; Onye nēnye ndi agu nāgu nri: Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ;


Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta.


nāsi ndi ekere ab͕u, Puanu; nāsi ndi nọ n'ọchichiri, Putanu n'ìhè. N'uzọ nile ka ha gāzù onwe-ha, ọ bu kwa n'ugwu nile ọhia nādighi ka ebe-ita-nri-ha gādi.


N'ihi na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ di n'obim, arọ nke ndi M'b͕aputaworo abiawo kwa.


ndi-isi nile na ndi Israel nile we nuru, bú ndi bàra n'ọb͕ub͕a-ndu ahu, izilaga, onye ọ bula orù-ya nwoke, na onye ọ bula nwanyi nējere ya ozi, inwere onwe-ha, ka madu ọ bula we ghara ime kwa ka ha fè ya òfùfè-orù ọzọ; ha we nuru, zilaga ha:


Okwu ahu nke ruru Jeremaia nti site na Jehova, mb͕e Zedekaia, bú eze, na ndi Israel nile ndi nọ Jerusalem, b͕asiri ndu, ikpọsara ha si na ha nwere onwe-ha;


Ma mb͕e ọ gēnye otù onye nime ndi-orù-ya onyinye nke sitere n'ihe-nketa-ya, ọ gābu kwa nke ya rue arọ izilaga orù ka o nwere onwe-ya; onyinye ahu we laghachikute onye-isi; nání na ihe-nketa-ya, bú ihe-nketa umu-ya ndikom, nke ha ka ọ gābu.


Jubile ka arọ nke-ọgu-abua-na-iri ahu gāburu unu: unu aghala nkpuru, unu ewe-kwa-la ihe-ubi nēpu n'onwe-ya nime ya, unu aghọrọ-kwa-la nkpuru nke osisi vine nile anākwachaghi akwacha.


N'arọ jubile a ka unu gālaghachi, onye ọ bula n'ihe-onwunwe-ya.


o gēsi kwa n'aka-gi pua, ya onwe-ya na umu-ya tiyere ya, ọ gālaghachikuru kwa ab͕uru-ya, ihe-onwunwe nke nna-ya-hà ka ọ gālaghachikuru kwa.


Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya n'arọ ndia, ọ gābu kwa n'arọ jubile, ya onwe-ya, na umu-ya tiyere ya.


Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu.


Ma Onye-nwe-ayi bu Mọ ahu: ma ebe Mọ nke Onye-nwe-ayi nọ, n'ebe ahu ka madu nwere onwe-ha.


N'ihi na Sainai nka bu ugwu di n'Arebia, ya na Jerusalem nke di ub͕u a kwu kwa: n'ihi na ọ nọ n'orù, ya na umu-ya.


N'ihi na unu onwe unu, umu-nnam, ka akpọrọ ka unu nwere onwe-unu; nání unu ewerela inwe-onwe-unu ahu nye ka ọ buru ihe anu-aru-unu gēji me ihe kama werenu ihunanya burita orù ibe-unu.


dika ndi nwere onwe-ha, ma unu enweghi inwe-onwe-unu ahu dika ihe-nkpuchi nke ihe ọjọ, kama dika ndi-orù nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan