Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 24:5 - Bible Nso

5 Ọzọ, i gēwere utu ọka flour, sie ya ka ọ buru ob͕e achicha iri na abua: uzọ abua n'uzọ iri nke ephah gādiri otù ob͕e achicha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 24:5
18 Iomraidhean Croise  

Elaija we chiri nkume iri na abua, dika ọnu-ọgugu ebo umu Jekob si di, bú onye okwu Jehova ruru nti, si, Israel gābu aha-gi.


na idozi achicha anēdo n'usoro, na idozi utu oka flour iji nye onyinye-inata-iru-ọma, na idozi mbadamba-achicha ekoghi-eko, na idozi ihe esiri n'ite isi ihe, na idozi ihe edere edè, na idebe ihe ọ bula itù ihe di miri miri na ihe ọ bula itù ihe ọzọ;


Ufọdu nime umu ndi Kohat, bú ufọdu nime umu-nne-ha, bu ndi-isi achicha anēdo n'usoro, idozi ya kwa-ubọchi-izu-ike.


ha nēsure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ kwa-ututu kwa-anyasi, ya na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda di iche iche me: achicha edoro n'usoro di kwa n'elu table ahu di ọcha: ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo na oriọna-ya nile di kwa, inwu enwu kwa-anyasi: n'ihi na ayi onwe-ayi nēdebe ihe-ndebe Jehova, bú Chineke-ayi; ma unu onwe-unu arapuwo Ya.


bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.


Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n'ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n'iwu:


I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum.


na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke;


O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.


I gēwebata kwa table ahu, do ihe ya n'usoro; i gēwe-bata kwa ihe-idọba-oriọna ahu, weli kwa oriọna-ya nile.


N'elu table nke irum ka ha gāb͕akwasi ákwà anunu, tiye kwa n'elu ya afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na ọkwa-ya nile, na iko nile nke nwusi àjà-ihe-ọṅuṅu: achicha anētiye mb͕e dum gādi kwa n'elu ya:


otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?


bú nkwa nke ebo-ayi iri na abua nēle anya na ha gēru, site n'ikpere Chineke si-ike abali na ehihie. Ọ bu kwa olile-anya nka ka ndi-Ju nēbom ebubo bayere ya, eze!


N'ihi na edoziri ulo-ikwū, ulo mbu, nke ihe-idọba-oriọna ahu, na table ahu, na ob͕e achicha ahu anēche n'iru Chineke di nime ya; nke anākpọ Ebe Nsọ.


Jemes, orù nke Chineke na nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ebo-ayi iri na abua ndi nọ na Nb͕asa ahu, nēkele unu.


Onye-nchu-àjà we nye ya achicha nsọ: n'ihi na ọ dighi achicha di n'ebe ahu ma-ọbughi achicha nke iru Chineke, nke anēwezuga n'iru Jehova, idọba achicha di ọku n'elu table n'ubọchi ewepuru ya.


Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan