Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 24:14 - Bible Nso

14 Me onye ahu nākọcha akọcha ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū; ndi nile nke nuru olu-ya gēbikwasi aka-ha n'isi-ya, nzukọ nile gātub͕u ya na nkume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 24:14
16 Iomraidhean Croise  

me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.


I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n'etiti umu Israel, ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya.


Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e mọ anāju ihe di nime ha, ma-ọbu nke bu dibia afa, aghaghi ime ka ha nwua: nkume ka ha gēwere tub͕ue ha: ọbara-ha gādikwasi ha.


Jehova we gwa Moses, okwu, si,


Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.


i gēme kwa ka nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu puta, bú ndi meworo ihe ọjọ a, rue ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, ọbuná nwoke ahu ma-ọbu nwayi ahu; i gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha nwua.


Aka ndi-àmà gēbu uzọ dikwasi ya ime ka ọ nwua, ma aka ndi Israel nile gādikwasi ya n'ikpe-azu. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.


ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan