Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 23:40 - Bible Nso

40 Unu gāchiri kwa n'onwe-unu n'ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu Onyenwe anyị Chineke unu ụbọchị asaa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 23:40
19 Iomraidhean Croise  

N'osisi willow di n'etiti ya Ka ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi.


Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.


ndi Jehova ab͕aputara ab͕aputa gālata kwa, were iti-nkpu-ọṅù bata nime Zaion; ọṅù ebighi-ebi gādi kwa n'isi-ha: obi-utọ na ọṅù ka ha gābiarute, iru-újú na ize-ume ewe b͕alaga.


ha ewe pue n'etiti ahihia, dika osisi willow n'akuku iyi juputara na miri.


Soronu Jerusalem ṅuria, teghari-kwa-nu egwú ọṅù n'ihi ya, unu ndi nile nāhu ya n'anya: ka obi tọ unu utọ n'ebe ọ nọ site n'obi-utọ, unu ndi nile nēru újú bayere ya:


Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa ahu, mb͕e unu chikọtasiri ihe-ọmume nke ala ahu, unu gēme ememe Jehova ubọchi asa: n'ubọchi mbu idebe-ubọchi-izu-ike gādi, n'ubọchi nke-asatọ idebe-ubọchi-izu-ike gādi kwa.


Unu gēme kwa ya dika ememe emere Jehova ubọchi asa n'arọ: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile: n'ọnwa nke-asa ka unu gēme ya.


Ndi kariri n'ìgwè madu ahu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ b͕ubitara alaka n'osisi, tusa kwa ha n'uzọ.


ha chiri igu nkwu, pua izute Ya, we nēti nkpu, si, Hosanna: Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi, bú Eze nke Israel.


Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.


ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi na Chineke site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye ayi siworo n'aka-Ya nata ime-ka-adi-n'otù a ub͕u a.


unu gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n'ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa.


unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.


n'ihi na ayi onwe-ayi bu ndi obibì-úgwù, ndi ji Mọ nke Chineke nēkpe ekpere, ndi nānya kwa isi nime Kraist Jisus, ndi natukwasighi kwa obi n'anu-aru-ayi:


Nāṅurinu ọṅu n'Onye-nwe-ayi mb͕e nile: m'gāsi ọzọ, Nāṅurinu ọṅu.


Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan