Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 23:39 - Bible Nso

39 Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa ahu, mb͕e unu chikọtasiri ihe-ọmume nke ala ahu, unu gēme ememe Jehova ubọchi asa: n'ubọchi mbu idebe-ubọchi-izu-ike gādi, n'ubọchi nke-asatọ idebe-ubọchi-izu-ike gādi kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 “ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ Onyenwe anyị mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 23:39
7 Iomraidhean Croise  

i gēdebe kwa ememe nke owuwe-ihe-ubi, bú nke nkpuru mbu nke i lutara n'ọlu, nke i nāgha n'ubi: na ememe nke nchikọta-ihe, n'ọgwugwu arọ, mb͕e i si n'ubi chikọta ihe nile i lutara n'ọlu.


Gwa umu Israel okwu, si, N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, idebe-ubọchi-izu-ike gādiri unu, ncheta nke uda-opì nādasi ike, nkpọkọta nsọ.


Gwa umu Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-asa nka ka ememe ulo-ntu gādiri Jehova ubọchi asa.


Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n'ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.


nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.


Unu gāchiri kwa n'onwe-unu n'ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa.


I gēmere onwe-gi ememe ulo-ntu ubọchi asa, mb͕e i chikọtasiri ihe sitere n'ebe-nzọcha-ọka-gi na n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan