Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 23:36 - Bible Nso

36 Ubọchi asa unu gēweta nso àjà-ọku ichuru Jehova: n'ubọchi nke-asatọ nkpọkọta nsọ gādiri unu; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova: ubọchi nb͕ochi ka ọ bu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 23:36
8 Iomraidhean Croise  

O we nāgu n'akwukwọ iwu Chineke kwa-ubọchi, site n'ubọchi mbu rue ubọchi ikpe-azu. Ha we me ememe ahu ubọchi asa; ma n'ubọchi nke-asatọ ubọchi-nb͕ochi di, dika ikpé-ya si di.


Donu obubu-ọnu nsọ, Kpọnu ubọchi nb͕ochi, chikọtanu ndi-okenye na ndi nile bi n'ala n'ulo Jehova, bú Chineke-unu, tiku-kwa-nu Jehova.


Fùanu opì-ike nime Zaion, donu obubu-ọnu nsọ, kpọsanu ubọchi nb͕ochi:


N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.


Ma n'ubọchi ikpe-azu, bú oké ubọchi nke ememe ahu, Jisus guzoro, we tie nkpu, si, Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku, ya biakutem, ṅua miri.


Ubọchi isi ka i gēri achicha ekoghi-eko: n'ubọchi nke-asa ubọchi nb͕ochi gādiri Jehova, bú Chineke-gi; ejela ozi nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan