Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 23:27 - Bible Nso

27 Otú ọ di, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa nke-asa nka ka ubọchi nkpuchi-nmehie gādi: nkpọkọta nsọ ka ọ gāburu unu, unu gēweda kwa nkpuru-obi-unu n'ala; unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 “Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara Onyenwe anyị onyinye site nʼọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 23:27
19 Iomraidhean Croise  

M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.


Ma mu onwem, mb͕e ha nāri ọria, uwem bu ákwà-nkpe: Ewedaram nkpuru-obim n'ala site n'obubu-ọnu; Ekperem nālaghachikute kwa obim.


Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.


Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M'nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n'ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n'ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ?


Eron gēweta kwa nso oke-ehi àjà-nmehie ahu, nke diri ya onwe-ya, o gēkpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ulo-ya, nmehie-ha, o gēb͕u kwa oke-ehi àjà-nmehie ahu nke diri ya onwe-ya:


Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie:


ọ gēkpuchi-kwa-ra ebe nsọ a nmehie-ya, n'ihi ọrurú nile nke umu Israel, na n'ihi njehie nile ha, bú nmehie-ha nile: otú a ka ọ gēme-kwa-ra ulo-ikwū nzute, nke nēbiyere ha n'etiti ọrurú nile ha.


ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Ọ dighi kwa ozi ọ bula unu gēje n'otu ubọchi ahu: n'ihi na ubọchi nkpuchi-nmehie ka ọ bu, ikpuchiri unu nmehie-unu n'iru Jehova, bú Chineke-unu.


I gēme kwa ka opì-ike nke nādasi uda ike gābiga rue ebe nile n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu; n'ubọchi nkpuchi-nmehie ka unu gēme ka opì-ike gabiga n'ala-unu nile.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


Ma mb͕e o ruru ọtutu oge, mb͕e ije-ub͕ọ di kwa egwu ub͕u a, n'ihi na ub͕u a ka oge Obubu-ọnu gasiri, Pọl we dọ ha aka na nti,


Hujunu anya, ru-kwa-nu újú, kwa-kwa-nu ákwá: ka ọchì-unu ghọ iru-újú, ka ọṅù-unu ghọ kwa nb͕aru-iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan