Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 23:21 - Bible Nso

21 Unu gākpọsa kwa òkù n'otù ubọchi ahu; nkpọkọta nsọ gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile rue ọbọ-unu nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 23:21
14 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.


N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà.


Onye-nchu-àjà gēfé kwa ha tiyere achicha nke nkpuru mbu ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova tiyere umu-aturu abua ahu: nsọ ka ha gādiri Jehova n'ebe onye-nchu-àjà nọ.


Ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: unu gēweta kwa nso àjà-ọku ichuru Jehova.


Ọ dighi ozi ọ bula unu gēje: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.


Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.


N'ubọchi mbu unu gēnwe nkpọkọta nsọ: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.


Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.


Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.


i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan