Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:6 - Bible Nso

6 madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi, ọ gagheri kwa ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, ma ọ buru na ọ saghi anu-aru-ya na miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:6
16 Iomraidhean Croise  

Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n'ọbu-aka-ya, n'etiti anu nile di ndu nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi.


Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu.


Ndia buru unu ihe ruru árú n'etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi.


Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha.


Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi.


Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi.


Onye ọ bula nke nēmetu ihe-ndina-ya aru gāsu uwe-ya nile, were kwa miri sa aru-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


ma-ọbu nwoke nke nēmetu ihe ọ bula nēnuputa enuputa aru, nke ruru árú n'ebe ọ nọ ma-ọbu nke nēmetu nwoke nke ruru árú n'ebe ọ nọ aru, ọbuná ọrurú-ya ọ bula;


Ma mb͕e anyanwu daworo, ọ gādi ọcha; emesia ọ gēri ihe ufọdu nime ihe nsọ nile, n'ihi na nri-ya ka ọ bu.


Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú.


Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.


Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan