Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:4 - Bible Nso

4 Nwoke ọ bula nke nkpuru Eron nke bu onye-ekpenta, ma-ọbu nke nwere orùrù; ọ gaghi-eri ihe ọ bula nime ihe nsọ nile, rue mb͕e ọ di ọcha. Ọzọ, onye nēmetu ihe ọ bula ruru árú nke madu nwuru anwu aru, ma-ọbu nwoke nke ure-ya nēsi n'aru-ya pua;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “ ‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:4
18 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi.


Uwe ọ bula, ma-ọbu akpukpọ ọ bula, nke ure dikwasi ya, agāsu ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi.


Ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu Bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọbu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.


ma nke fọduru site n'onyinye-inata-iru-ọma ahu bu ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe: ọ bu ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile sitere n'àjà-ọku nile anāchuru Jehova.


Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n'ihi madu nwuru anwu n'etiti umu-nna-ya;


Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri.


Hagai we si, Ọ buru na onye ruru árú site na madu nwuru anwu emetu ihe ọ bula n'ihe ndia, ọ̀ gāru árú? Ndi-nchu-àjà we za, si, Ọ gāru árú.


Àjà-nbuli nile nke ihe nsọ nile, nke umu Israel nēbuliri Jehova, ka M'nyeworo gi, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi: ọb͕ub͕a-ndu nnú ebighi-ebi n'iru Jehova ka ọ buru gi, buru kwa nkpuru-gi tiyere gi.


Nka gābu nke gi site n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, site n'ọku: onyinye-ha ọ bula iji biaru nso, ọbuná onyinye-inata-iru-ọma-ha ọ bula, na àjà-nmehie-ha ọ bula, na àjà-ikpe-ọmuma-ha ọ bula, nke ha gēnyeghachim, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu gi, buru kwa umu-gi ndikom.


Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan