Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:3 - Bible Nso

3 Si ha, Nwoke ọ bula nke nkpuru-unu nile rue ọb͕ọ-unu nile, nke nābiaru nso ihe nsọ nile, nke umu Israel nēdoro Jehova nsọ, ma orurú-ya di n'aru ya, agēbipu madu ahu n'irum: Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 “Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:3
10 Iomraidhean Croise  

M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.


I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.


Atupulam n'iru Gi; Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.


Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.


Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'Israel n'ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a.


Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:


bú madu ndi gāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpe ziri ezi, bú nbibi ebighi-ebi nke sitere n'iru Onye-nwe-ayi, site kwa n'ebube nke ike-Ya,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan