Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:27 - Bible Nso

27 Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n'okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n'ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 “Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:27
8 Iomraidhean Croise  

Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.


Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem.


Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova.


Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Samuel we were otù nwa-aturu nke nāṅu ara, o we sure ya ọku ka ọ buru àjà-nsuresi-ọku anēsurere Jehova: Samuel we tikue Jehova nkpu bayere Israel; Jehova we za ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan