Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:20 - Bible Nso

20 Ihe ọ bula nke ọlu di n'aru ya, unu ewetala ya nso: n'ihi na ọ gaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:20
14 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.


Ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu àjà-nsure-ọku sitere n'ìgwè ehi, oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso: n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ka ọ gēweta ya nso, ka o we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova


Ihe nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia, ma-ọbu nke piara apia, ma-ọbu nke adọwapuru adọwapu, ma-ọbu nke ebipuru ebipu, unu ewetala ya nso Jehova: unu eme-kwa-la otú a n'ala-unu.


Unu esite-kwa-la n'aka onye ala ọzọ weta nso nri Chineke-unu site n'ihe ndia nile; n'ihi na nbibi-ha di nime ha, ọlu di n'aru ha: ha agaghi-abu ihe nātọ utọ n'ọnọdu unu.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso, nke, ọ nēnye ka ọ buru ihe àjà nke àjà-udo ichuru Jehova, esi n'ìgwè ewu na aturu puta; oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso.


Ọzọ, mḅe unu nēweta anu kpuru ìsì nso, ihe ọjọ adighi ya! mḅe unu nēweta nso nke gwọrọ ngwurọ na nke nāria ọria, ihe ọjọ adighi ya! Biko, weta ya nso onye nāchi ala-gi; ìhe-gi gātọ ya utọ? ma-ọbu ọ̀ gāhu gi iru-ọma? otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n'iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n.aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya:


ma unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova, bú ihe ísì utọ; otù nwa-oke-ehi, otù ebulu, umu-aturu asa nke b͕ara otú arọ; nke zuru okè ha gāburu unu:


Ma mb͕e ọlu di n'aru-ya, dika ngwurọ ma-ọbu ìsì, ọlu ọ bula nke jọrọ njọ, achurula ya Jehova, bú Chineke-gi.


Achurula Jehova, bú Chineke-gi, ehi, ma-ọbu aturu, nke ọlu di n'aru-ya, bú ihe ọjọ ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu.


ọ̀bara Kraist, Onye sitere n'aka Mọ ebighi-ebi che Onwe-ya nātaghi uta n'iru Chineke, gēsi aṅa ghara ime akọ-na-uche-ayi ka ọ di kari ọcha nke-uku ri nne pua n'ọlu nile nwuru anwu ikpere Chineke di ndu?


kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n'aru, bú ọbara nke Kraist:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan