Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:2 - Bible Nso

2 Gwa Eron na umu-ya ndikom okwu, ka ha kewapu onwe-ha n'ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ndi ahu nēdorom nsọ, ka ha ghara kwa ime ka aha nsọm ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:2
16 Iomraidhean Croise  

M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.


na i gēme ka nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa gabigara Jehova, ya na nwa ọ bula meghere àkpà-nwa, bú nwa anu-ulo muru, nke i nwere; ndi bu oké ka Jehova gēnwe.


Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova.


Wezuganu onwe-unu, wezuganu onwe-unu, sinu n'ebe ahu pua, unu emetula ihe ruru árú: sinu n'etiti ya pua: dinu ọcha, unu ndi nēbu ihe di iche iche nke Jehova.


Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n'ebe nsọm nye onwe-unu.


Unu gēkewapu kwa umu Israel n'ọrurú-ha; ka ha we ghara inwu n'ọrurú-ha, mb͕e ha meruru ebe-obibim nke di n'etiti ha.


Enye-kwa-la onye ọ bula nime nkpuru-gi ime ka ha gabiga rue Molek, eme-kwa-la ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


Unu ewe-kwa-la aham ṅu iyi n'okwu-ugha, we me ka aha Chineke-gi ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova.


Mu onwem gēche kwa irum megide nwoke ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya; n'ihi na ufọdu nime nkpuru-ya ka o nyeworo Molek, ka o we meru ebe nsọm, na ime ka aha nsọm ghara idi nsọ.


Ndi nsọ ka ha gāburu Chineke-ha, ha agaghi-eme kwa ka aha Chineke-ha ghara idi nsọ: n'ihi na àjà-ọku Jehova, bú nri Chineke-ha, ka ha onwe-ha nēweta nso: ha gādi kwa nsọ.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n'etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ,


Unu agaghēbu kwa nmehie bayere ya, mb͕e unu si na ya bulie ihe-ya kachasi nma: unu agaghi-emeru kwa ihe nsọ nile nke umu Israel, unu agaghi-anwu kwa.


Nwa ọ bula, bú oké, nke eburu uzọ mu, nke agāmu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, i gēdoro ya Jehova, bú Chineke-gi, nsọ: ejila nwa nke ehi-gi buru uzọ mu lu ọlu-ubi, akpacha-kwa-la aji nke nwa eburu uzọ mu nke ìgwè ewu na aturu-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan