Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:18 - Bible Nso

18 Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa n'Israel, nke nēweta nso onyinye-ya iji biaru nso, bú nke diri nkwa-ha nile, ma-ọbu nke diri onyinye-afọ-ofufo-ha nile, nke ha nēweta nso Jehova ka ọ buru àjà-nsure-ọku;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:18
29 Iomraidhean Croise  

Kore nwa Imna, bú onye Livai, onye-ọnu-uzọ-ama n'akuku ọwuwa-anyanwu, bu onye-isi onyinye-afọ-ofufo Chineke, inye àjà-nbuli Jehova na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile.


Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile.


Ka m'kwughachi Jehova nkwa nile m'kwere, Ka m'kwughachi ha n'iru ndi-Ya nile;


N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba: M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya.


N'isim, Chineke, ka nkwa nile m'kwere Gi di: M'gākwughachi Gi ekele nile.


N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere: I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.


Otú a m'gābùku aha-Gi abù ọma rue mb͕e ebighi-ebi, Ka m'we kwughachi nkwam nile kwa-ubọchi.


Gi ka otuto nēdere du, Chineke, nime Zaion: Ọ bu kwa Gi ka anākwughachi nkwa ekwere.


M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi, M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,


Nwa-aturu unu nwere gābu nke zuru okè, oké nke b͕ara otù arọ: n'etiti aturu ma-ọbu n'etiti ewu ka unu gēsi weputa ya:


Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso sitere n'ìgwè ewu na aturu, site n'aturu, ma-ọbu site n'ewu, bú nke ọ nēweta nso ibu àjà-nsure-ọku; oké zuru okè ka ọ gēweta ya nso.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e madu ọ bula n'etiti unu gēweta nso Jehova onyinye iji biaru nso, unu gēsi n'etiti anu-ulo, n'etiti ìgwè ehi na n'etiti ìgwè ewu na aturu weta nso onyinye-unu ijì biaru nso.


Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.


Ọzọ nwoke ọ bula nke sitere n'umu Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nāchu ntá ihe, ma ọ bu anu-ọhia ma-ọbu anu-ufe, nke anēri eri; ọ gāwusi kwa ọbara-ya, were ájá kpuchi ya.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


nāgughi ubọchi-izu-ike nile nke Jehova, nāgughi kwa onyinye nile unu, nāgughi kwa nkwa-unu nile, nāgughi kwa onyinye-afọ-ofufo-unu nile, nke unu nēnye Jehova.


Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya:


sure-kwa-nu àjà-ekele dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ site n'achicha ekoro eko, kpọsa-kwa-nu onyinye-afọ-ofufo di iche iche, me ka anuru ihe bayere ha: n'ihi na ihe di otú a ka unu huworo n'anya, umu Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ndikom ahu we tua egwu Jehova nke-uku, ha we chuara Jehova àjà, kwe nkwa di iche iche.


Ma mu onwem gēji olu ekele chuara Gi àjà; Ihe nke m'kweworo na nkwa ka m'gākwughachi. Nzọputa diri Jehova.


Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.


Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n'ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n'ihi na eze uku ka M'bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n'etiti mba nile.


mb͕e unu gēme kwa àjà-ọku ichuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu n'onyinye-afọ-ofufo, ma-ọbu na mb͕e nile unu akara àkà, ime ihe ísì utọ isurere Jehova, sitere n'ìgwè ehi, ma-ọbu n'ìgwè ewu na aturu:


Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa.


I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:


ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:


I gēme-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ememe nke izù asa nke ubọchi asa, dika ọtùtù nke onyinye-afọ-ofufo nke aka-gi si di, nke i gēnye, dika Jehova, bú Chineke-gi, nāgọzi gi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan