Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 22:13 - Bible Nso

13 Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 22:13
11 Iomraidhean Croise  

Juda we si Tema, bú nwunye nwa-ya, Nọdu n'ọnọdu nwayi di-ya nwuru n'ulo nna-gi, rue mb͕e Shila, bú nwam, gētozù: n'ihi na ọ siri, Ka ya onwe-ya we ghara inwu kwa, dika umu-nne-ya. Tema we je nọdu n'ulo nna-ya.


Tiashata we si ha, ka ha ghara iri ihe n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, rue mb͕e onye-nchu-àjà gēwere Ìhè na Izu-okè guzo.


Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:


Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n'ihi na nsọ ka ha di.


Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n'ebe nsọm nye onwe-unu.


Okpukpu-obi nke àjà-ofufé na utaku-ukwu nke àjà-nbuli ka unu gēri kwa n'ebe di ọcha; gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na umu-gi ndinyom tiyere gi: n'ihi na dika òkè-gi na òkè umu-gi ndikom ka enyeworo ha site n'ihe àjà nile nke àjà-udo nile nke umu Israel.


Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n'ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu.


Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.


Ma mb͕e o si n'ulo-ya pua, ọ gēje kwa buru nwunye nke nwoke ọzọ.


Ma otù nwoke n'etiti ndi-orù Sọl nọ n'ebe ahu n'ubọchi ahu, onye anēb͕ochi ka ọ ghara ipu n'iru Jehova; aha-ya bu Doeg, onye Edom, onye kachasi ike n'etiti ndi-ọzùzù anu-ulo ndi Sọl nwere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan