Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 21:9 - Bible Nso

9 Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n'ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n'ọku ka agēsure ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “ ‘Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja emerụọ onwe ya site nʼịghọ onye akwụna, o sitela na ndụ ọjọọ dị otu a wetara nna ya ihe ihere. A ga-akpọ ya ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 21:9
16 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.


Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n'ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n'ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n'etiti umu-nna-ya.


Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?


b͕usisianu okenye na okorọbia na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke na umu-ntakiri na ndinyom: ma unu abiarula nso onye ọ bula nke akàrà ahu di ya n'iru; ma n'ebe nsọm ka unu gēsi malite. Ha we malite n'etiti ndi-okenye ndi nọ n'iru ulo ahu.


Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.


Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n'ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n'etiti unu.


Le, M'gaje ibasiri nkpuru-ọghigha nba ike n'ihi unu, fesa unu ǹsí-anu n'iru, bú ǹsí-anu nke anu ememe nile unu; agēbupu unu je n'ebe ọ di.


ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


ọ buru na onye ọ bula bu onye anāpughi ibo ebubo, di nke otù nwunye, nēnwe umu kwere ekwe, bú ndi anēboghi ebubo na ha nādi ndu ila-n'iyì, ndi nābughi kwa ndi nēkweghi inọ n'okpuru iwu.


Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel.


Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.


Nmehie umu-okorọbia ahu we di ukwu ri nne n'iru Jehova: n'ihi na ndikom ahu nēleli-onyinye-inata-iru-ọma nke Jehova.


Nka gābu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama, nke gābiakwasi umu-gi abua, bú Họfnai na Finehas; n'otù ubọchi ka ha abua gānwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan