Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n'ihi na ọlu di n'aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.
Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia.