Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 21:10 - Bible Nso

10 Ma onye-nchu-àjà n'etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n'isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “ ‘Onyeisi nchụaja, onye ahụ sitere nʼetiti ụmụnna ya, onye awụsara mmanụ nsọ nʼisi ya, onye ahọrọ doo nsọ iyiri uwe onye nchụaja ahụ, agaghị ahapụ agịrị isi ya ka ọ kpasasịa, maọbụ dọwaa uwe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 21:10
18 Iomraidhean Croise  

Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi.


Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.


Job we bilie, dọwa uwe-nwuda-ya; kọpu isi-ya, da n'ala, kpọ isi ala;


Ọ di ka ezi manu ahu nke dikwasi n'isi, Nke nērùda n'afu-ọnu, Bú afu-ọnu Eron; Nke nēruda n'ọnu uwe-nwuda-ya nile;


I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n'isi-ya, we te ya.


Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n'isi-gi n'onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n'ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ.


Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.


Onye-nchu-àjà ahu, nke agēte manu, nke agēmeju kwa aka-ya ibu onye-nchu-àjà n'ọnọdu nna-ya, ọ gēkpuchi nmehie, yiri kwa uwe ákwà ọcha ahu, bú uwe nsọ ahu:


ọ buru na onye-nchu-àjà etere manu emehie dika ikpe-ọmuma ndim si di; ọ gēweta kwa nso nwa-oke-ehi zuru okè bayere nmehie-ya, nke o mehieworo, ichuru Jehova, ka ọ buru àjà-nmehie.


Ọ wukwasi kwa ufọdu nime manu otite-manu ahu n'isi Eron, te kwa ya manu, ido ya nsọ.


nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n'obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.


Ọ gaghi-emeru onwe-ya bayere nna-ya, ma-ọbu bayere nne-ya, ma-ọbu bayere nwa-nne-ya nwoke, maọbu bayere nwa-nne-ya nwayi, mb͕e ha nwuru; n'ihi na nkewaputa Chineke-ya di n'isi-ya.


Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan