Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 20:9 - Bible Nso

9 N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “ ‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 20:9
17 Iomraidhean Croise  

Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.


Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.


Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.


Onye nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, Oriọna-ya gānyu na nb͕achi nke ọchichiri.


Ọb͕ọ di nke nākọcha nna-ha, Ha adighi-agọzi kwa nne-ha.


Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya.


n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.


Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.


Nwayi ọ bula nke nābiaru nso anumanu ọ bula, iso ya dina, i gēb͕u nwayi ahu na anumanu ahu: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.


Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e mọ anāju ihe di nime ha, ma-ọbu nke bu dibia afa, aghaghi ime ka ha nwua: nkume ka ha gēwere tub͕ue ha: ọbara-ha gādikwasi ha.


N'ihi na Chineke siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Onye kwujọrọ nna maọbu nne, ya nwua ọnwu ahu.


Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi.


N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulo-gi pua n'èzi, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya.


ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan