Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 20:6 - Bible Nso

6 Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “ ‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 20:6
17 Iomraidhean Croise  

N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì: I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.


Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.


Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.


Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a: Le, M'gaje ido irum imegide unu ime unu ihe ọjọ, ọbuná ibipu Juda nile.


Ndi-unu b͕apuru ab͕apu gēcheta kwa Mu onwem n'etiti mba nile ebe adọtara ha n'agha, mb͕e M'tiwaworo obi-ha nke nākwa iko, nke siworo n'ebe M'nọ wezuga onwe-ya, na anya-ha, nke nākwaso arusi nile ha iko: ha gāsọ kwa onwe-ha oyi n'iru ha n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo n'ihe-árú nile ha.


Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.


Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.


Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.


Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ma nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e mọ anāju ihe di nime ha, ma-ọbu nke bu dibia afa, aghaghi ime ka ha nwua: nkume ka ha gēwere tub͕ue ha: ọbara-ha gādikwasi ha.


Mu onwem gēdo kwa irum megide nwoke ahu, megide kwa ab͕uru-ya, Mu onwem gēbipu kwa ya ndi-nile nēso ya kwa iko, bú iso Molek kwa iko, n'etiti ndi-ha.


ọ gābu-kwa-ra unu ọnu-ọnu usọ uwe, ka unu we hu ya anya, we cheta ihe nile Jehova nyere n'iwu, me kwa ha; ka unu we ghara kwa iledo otú unu gēso obi-unu, otú unu gēso kwa anya-unu, nke unu onwe-unu nēso ha ikwa iko:


O we rue, mb͕e ayi nāga ebe ekpere, na otù nwa-ab͕ọghọ onye nwere mọ nke anākpọ Paiton zutere ayi, onye nēwetara ndi-nwe-ya ọtutu urù site n'ibu amuma ugha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan