Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 20:14 - Bible Nso

14 Nwoke ọ bula nke nēkuru nwayi na nne-ya, nzube ọjọ ka ọ bu: n'ọku ka agēsure ha, ya na ha; ka nzube ọjọ we ghara idi n'etiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “ ‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 20:14
6 Iomraidhean Croise  

Ekpughela ọtọ nwanyi na nwa ya nwanyi; ekurula nwa-nwanyi nke nwa-ya nwoke, ma-ọbu nwa-nwayi nke nwa ya nwanyi, ikpughe ọtọ-ya; ndi-aru ka ha bu: nzube ọjọ ka ọ bu.


Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n'ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n'ọku ka agēsure ya.


ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nne-nwunye-ya nēdina. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Ọ gēru kwa, na onye anwudere ya na ihe ahu ewezugara nye Jehova, agēsure ya n'ọku, ya onwe-ya na ihe nile o nwere: n'ihi na ọ gabigawo ọb͕ub͕a-ndu Jehova, na n'ihi na o mewo ihe-nzuzu n'Israel.


Joshua we si, Gini mere i mekpaworo ayi aru? Jehova gēmekpa gi aru ta. Israel nile we were nkume ub͕ue ya; ha we sure ha n'ọku, were kwa nkume tub͕ue ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan