Ma onye nke nēmeghi iwu Chineke-gi, na iwu eze, ka ewere ngwa ngwa me ya ihe ekpere n'ikpe, ma ọ bu inwu ọnwu, ma-ọbu iwepu ya n'ala, ma-ọbu iri àkù-ya na nra, ma-ọbu ike ya ab͕u.
Ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Tofet, nke di na ndagwurugwu nwa Hinom, isure umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom n'ọku; bú ihe nke M'nēnyeghi n'iwu, ọ bataghi kwa n'obim.
I gāsi kwa umu Israel, Nwoke ọ bula n'etiti umu Israel, ma-ọbu n'etiti ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēnye Molek otù nwa nime nkpuru-ya: aghaghi ime ka ọ nwua: ndi ala-unu gēwere nkume tub͕ue ya.
Ọ buru na unu atua egwu Jehova, ọ buru kwa na unu efè Ya òfùfè, we ge nti olu-Ya, ọ buru kwa na unu anupughi isi n'okwu-ọnu Jehova, kama na unu nēsogide Jehova, bú Chineke-unu, ma unu onwe-unu ma eze-unu kwa nke bu eze-unu, ọ di nma: