Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 2:4 - Bible Nso

4 Ma mb͕e i gēweta nso onyinye iji biaru nso, bú onyinye-inata-iru-ọma esiri n'ite-ọku, ọ gābu ob͕e achicha ekoghi-eko nke utu ọka flour agwara manu, ma-ọbu mbadamba-achicha ekoghi-eko nke etere manu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 2:4
21 Iomraidhean Croise  

Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm.


Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya.


Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me.


na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.


Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o


Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;


O we sim, Nka bu ebe ahu ebe ndi-nchu-àjà gēsi anu àjà-ikpe-ọmuma na anu àjà-nmehie, ebe ha gēsi onyinye-inata-iru-ọma; ka ha we ghara iweputa ha n'ogige di n'èzí, ido ndim nsọ.


Ọ gēb͕u kwa ya n'iru Jehova n'akuku ebe-ichu-àjà chere iru n'Ugwu: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


Moses we gwa Eron okwu, ọ gwa kwa Eleeza na Itama, bú umu-ya ndikom fọduru, si, Werenu onyinye-inata-iru-ọma nke fọduru site n'àjà-ọku nke Jehova, rie ya n'ekoghi-eko na nso ebe-ichu-àjà: n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu.


Agaghēwere ihe nēko achicha sie ya. Enyewom ya ka ọ buru òkè-ha sitere n'àjà-ọkum nile; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, dika àjà-nmehie, na dika àjà-ikpe-ọmuma.


Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.


na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.


Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche.


Ub͕u a ka nkpuru-obim nālọ miri; gini ka M'gēkwu kwa? Nna, zọputam n'oge hour nka. Ma n'ihi nka ka M'biaruru oge hour nka.


N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ.


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;


Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,


Onye ọ dighi nmehie ọ bula O mere, ahughi kwa aghughọ n'ọnu-Ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan