Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 19:4 - Bible Nso

4 Unu echela ihe-efu ọ bula iru, unu eme-kwa-lara onwe-unu chi ọ bula awuru awu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 19:4
19 Iomraidhean Croise  

ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:


N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe.


kama o jere ije n'uzọ nile nke ndi-eze Israel, ọzọ kwa, o mere arusi awuru awu nye Bealim.


N'ihi na chi nile nke ndi nile di iche iche bu ihe-efu: Ma Jehova mere elu-igwe.


Unu emela chi ọzọ tiyerem; chi ọla-ọcha ma-ọbu chi ọla-edo, unu emerela onwe-unu ha.


Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


Gi emerela onwe-gi chi akpuru akpu.


N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu.


Ma n'arọ nke-ise unu gēri nkpuru-ya, ka ọ we mikwasiri unu ihe ọmume-ya: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ma mb͕e unu gāchuru Jehova àjà nké àjà-udo, unu gāchu ya ka unu we buru ihe nātọ utọ.


Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.


N'ihi nka, ndi m'huru n'anya, b͕anarinu ikpere-arusi.


Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.


ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye,


Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:


Umu-ntakirim, chenu onwe-unu nche ka unu ghara ikpere arusi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan