Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 19:28 - Bible Nso

28 Unu eb͕ula eb͕ub͕u n'anu-aru-unu n'ihi nkpuru-obi madu, unu etiye-kwa-la ihe-odide, bú eb͕ub͕u-ọku, n'aru unu: Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 “ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 19:28
18 Iomraidhean Croise  

Ha we were oké olu kpọ, were mma-agha na ube bìe aru onwe-ha dika ha si eme, rue mb͕e ọbara wukwasiri ha.


Ha gānwu kwa, ma ndi uku ma ndi ntà, n'ala nka: agaghi-elì ha, madu agaghi-eti-kwa-ra ha aka n'obi, madu agaghi-ebì kwa onwe-ya mma, ọ gaghi-eme-kwa-ra ha isi-nkwọcha:


N'ihi na isi nile ọ bula kwọchara akwọcha, ọ bu kwa afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo: n'aka nile ka obibì-mma dikwasi, n'úkwù nile ka ákwà-nkpe di kwa.


Unu akọpula usọ isi-unu buruburu, ebibi-kwa-la usọ afu-ọnu-gi.


Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.


Jehova we si Moses, Gwa ndi-nchu-àjà, bú umu-ndikom Eron, okwu, si ha, Onye-nchu-àjà agaghi-emeru onwe-ya n'ihi madu nwuru anwu n'etiti umu-nna-ya;


ọ gaghi-abakuru kwa madu nwuru anwu, ọ gaghi-emeru kwa onwe-ya n'ihi nna-ya, ma-ọbu n'ihi nne-ya;


Ha agaghi-eme onwe-ha isi-nkwọcha n'isi-ha, ha agaghi-akọpu kwa usọ afu-ọnu-ha, ha agaghi-eb͕u kwa eb͕ub͕u n'anu-aru-ha.


Mb͕e nile, abali na ehihie, o nēti kwa nkpu, were kwa nkume nēyikasi onwe-ya, n'ebe anēlì ozu na n'ugwu.


Ya mere ndi ọzọ nēso uzọ Jisus si ya, Ayi ahuwo Onye-nwe-ayi. Ma ọ siri ha, Ọ buru na ahughm n'aka-Ya abua apa ǹtú, tiye kwa nkpisi-akam n'apa ǹtú ahu, tiye kwa akam n'akuku-Ya, m'gaghi-ekwe ma-ọli.


Unu onwe-unu buru Jehova, bú Chineke-unu, umu: unu ebìla onwe-unu mma, unu eme-kwa-la isi-nkwọcha n'etiti anya-unu abua n'ihi onye nwuru anwu.


anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.


Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya,


M'we hu dika agāsi na ọ bu oké osimiri eji enyo me nke agwakọworo ya na ọku; ahu-kwa-ram ndi nāputa n'aka anu-ọhia ahu na nmeri, ya na n'aka ihe-oyiyi-ya, na n'aka ọnu-ọgugu aha-ya, ka ha nēguzo n'usọ oké osimiri ahu eji enyo me, nēnwe ubọ-akwara nke Chineke.


Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.


Ewe jide anu-ọhia ahu, ya na onye-amuma ugha ahu nke nēme ihe-iriba-ama ahu n'iru ya, bú nke o ji duhie ndi natarari akàrà nke anu-ọhia ahu, na ndi nākpọ isi ala nye ihe-oyiyi-ya: ewe tubà ha abua na ndu nime ọdọ ọku ahu nke ji brimstone nēre:


M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan