Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 19:23 - Bible Nso

23 Ma mb͕e unu gābà n'ala ahu, mb͕e unu gākuwori osisi nile ọ bula ibu ihe-oriri, unu gāgu kwa nkpuru-ya n'ebighi-úgwù-ya: arọ atọ ka ọ gāburu unu ihe anēbighi úgwù; agaghi-eri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 “ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 19:23
12 Iomraidhean Croise  

Moses we kwue n'iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu?


Moses we si n'iru Jehova, Le, mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu, Fèro gēsi kwa aṅa gem nti?


Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.


N'ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n'anu-aru nke api-ya.


Mb͕e unu gābata n'ala Kenean, nke Mu onwem nēnye unu ka ọ buru ihe-onwunwe, M'we tiye ihe-otiti ekpenta n'ulo ọ bula nke ala ahu, bú ihe-onwunwe-unu;


Onye-nchu-àjà gēwere kwa ebulu àjà-ikpe-ọmuma ahu kpuchiri ya nmehie-ya n'iru Jehova bayere nmehie-ya nke o mehieworo: agāb͕aghara kwa ya nmehie-ya nke o mehieworo.


Ma n'arọ nke-anọ nkpuru-ya nile gādi nsọ, otuto anēto Jehova.


Oke-ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu ewu, mb͕e amuru ya, ọ gādi kwa n'okpuru nne-ya ubọchi asa; ma site n'ubọchi nke-asatọ we gaba ọ gābu ihe nātọ utọ ibu onyinye iji biaru nso nke àjà-ọku anāchuru Jehova.


Unu eri-kwa-la achicha, ma-ọbu ọka aṅara aṅa, ma-ọbu ọka rara oko, rue otù ubọchi a, rue mb͕e unu wetara onyinye iji biaru nso nke Chineke-unu: ọ bu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile.


Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan