Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 19:19 - Bible Nso

19 Unu gēdebe ukpurum nile. Emela ka anu-ulo-gi di iche iche nāb͕a onwe-ha: aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-gi: uwe nke eji uzọ ihe abua kpakọta agaghi-abia n'aru-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 19:19
18 Iomraidhean Croise  

Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere.


Umu-okorọbia Absalom we me Amnon dika Absalom nyere iwu. Umu-ndikom eze nile we bilie, rikwasi, nwoke ọ bula n'elu inyinya mule-ya, ha we b͕alaga.


Absalom we zute ndi-orù Devid. Ma Absalom nānọkwasi n'inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n'okpuru alaka tuhiri atuhi nke oké osisi terebinth, isi-ya we kogide n'osisi terebinth ahu, ewe do ya n'etiti elu-igwe na ala; ma inyinya mule ahu nke di n'okpuru ya gabigara.


Eze we si ha, Chirinu ndi-orù onye-nwe-unu tiyere onwe-unu, me ka Solomon, bú nwam, nọkwasi n'inyinya mule nke m'nwere, me-kwa-nu ka ọ ridarue Gaihon:


Inyinya-ha di nnù na ọgu iri-na-isi na iri na isi; inyinya mule ha di ọgu iri-na-abua na ise;


Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.


Unu gēdebe ukpurum nile, me ha: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ.


Unu gēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu, unu gēme kwa ha: Mu onwem bu Jehova.


Unu gēme kwa ukpurum nile, ikpém nile ka unu gēdebe kwa, me kwa ha; unu gēbi kwa n'ala ahu na ntukwasi-obi.


O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie.


Ma ọ buru na ọ di n'amara, o siteghi kwa ọzọ n'ọlu: ebe ahuru na amara abughi amara ọzọ, ma asi na ọ dighi otú a.


Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.


Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan