Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 19:18 - Bible Nso

18 Abọla ọ́bọ̀, edebe-kwa-la iwe megide umu ndi-gi, ma hu madu-ibe-gi n'anya dika onwe-gi: Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 “ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 19:18
30 Iomraidhean Croise  

Lemek we si ndinyom-ya: Eda na Zila, nurunu olum; Ndinyom Lemek, genu nti n'okwu-ọnum: N'ihi na nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ob͕ub͕u-mmam, Ọ bu kwa nwata-nwoke ka m'b͕uworo n'ihi ubiri-utarim:


Ma Absalom agwaghi Amnon okwu ọ bula ma ọ bu nke di njọ ma-ọbu nke di nma: n'ihi na Absalom kpọrọ Amnon asì. n'ihi na ọ wedara Tema nwa-nne-ya n'ala.


Absalom we nye ndi-orù-ya iwu, si, Biko, lezienu anya. mb͕e obi Amnon di nma na manya-vine; mb͕e m'si kwa unu, Tibuenu Amnon, menu ka ọ nwua, unu atula egwu: ọ̀ bughi na mu onwem enyewo unu iwu? dinu ike, buru-kwa-nu ndi-dìnkpà.


Ọ bughi rue mgbe nile ka Ọ ganēse okwu; Ọ bughi kwa rue mb͕e ebighi-ebi ka Ọ ganēdebe iwe.


Gi ab͕ala àmà ugha megide madu-ibe-gi.


Asila, M'gākwughachi ugwọ ihe ọjọ: Le anya Jehova, Ọ gāzọputa kwa gi.


Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Ma le, otù onye biakutere Ya, si, Onye-ozizí, ọ̀ bu ezi ihe gini ka m'gēme, ka m'we nwe ndu ebighi-ebi?


Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.


Iwu ọhu M'nēnye unu, ka unu hurita ibe-unu n'anya; dika M'huru unu n'anya, ka unu onwe-unu hurita kwa ibe-unu n'anya.


Ma Pọl were oké olu ti nkpu, si, Emerula onwe-gi aru: n'ihi na ayi nile nọ n'ebe a.


Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile.


Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru.


n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi n'ebe i nọ iwetara gi ezi ihe. Ma ọ buru na i nēme ihe ọjọ, tua egwu; n'ihi na ọ bughi n'efu ka o nēbu mma-agha: n'ihi na ọ bu onye nējere Chineke ozi, onye-ọ́bọ̀ iwetara onye nēme ihe ọjọ iwe.


N'ihi na okwu a, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Agu ihe ọjọ agula gi, ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di enyere n'iwu, achikọtara ya n'okwu a, bú, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.


N'ihi na edebezuwo iwu nile n'otù okwu, bú nka; Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.


ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù,


Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu:


Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.


Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.


Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta


N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé.


Otú ọ di, ọ buru na unu edebezu iwu nke Eze-ayi, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si kwu, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, unu nēme nke-ọma:


Ya mere, tupunu ihe ọjọ nile, na aghughọ nile, na iru-abua, na ekworo, na nkwutọ nile di iche iche,


Ihe a enyere n'iwu ka ayi nwe-kwa-ra site n'ebe Ọ nọ, ka onye nāhu Chineke n'anya, ka ọ hu kwa nwa-nna-ya n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan