Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:9 - Bible Nso

9 Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:9
6 Iomraidhean Croise  

Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.


Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu.


Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya.


Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan