8 Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu.
8 “ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.
O rue, mb͕e Israel biri n'ala ahu, na Reuben jere dinayere Bilha, bú iko-nwayi nna-ya: Israel we nu ya. Ma umu-ndikom Jekob di iri na abua:
I nāb͕oghari dika miri, akarila akari; N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi: Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem.
Ọtọ nna ka ekpugheworo nime gi: nwanyi nke ruru árú n'idi-na-nsọ-ya ka ha wedaworo n'ala nime gi.
Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nna-ya nēdina, ọtọ nna-ya ka o kpugheworo: aghaghi ime ka ha abua nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.
ha bu ndi nēghekpọso ájá ala n'isi ndi nēnweghi ike, ọ bu kwa uzọ ndi di ume-ala n'obi ka ha nēwezuga: ọzọ, nwoke na nna-ya nējekuru otù nwa-ab͕ọghọ ahu, ka ha we me ka aha nsọm ghara idi nsọ:
Anānu nọ̄ na ikwa-iko di n'etiti unu, aha ikwa-iko nke nādighi kwa ọbuná n'etiti ndi mba ọzọ, nke mere na otú onye n'etiti unu nwere nwunye nna-ya.
Nwoke agaghi-ekuru nwunye nna-ya, ọ gaghi-ekpughe kwa uwe kpuchiri ọtọ nna-ya.
Onye emetara ọnyá site n'ichipia nkpuru-amu-ya, ma-ọbu nke ebipuru amu-ya, agaghi-abà nime nkpọkọta Jehova.
Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwunye nna-ya nēdina; n'ihi na o kpughewo uwe kpuchiri ọtọ nna-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.