Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:3 - Bible Nso

3 Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:3
15 Iomraidhean Croise  

we jeghari n'ukpuru nile nke mba ọzọ, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel, na n'ukpuru ndi-eze Israel, nke ha mere.


Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha:


Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.


Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n'Ijipt ka ọ nārapughi; n'ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri.


Unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile nke mba ahu, nke Mu onwem nāchupu n'iru unu: n'ihi na ihe ndia nile ka ha mere, ike ha we gwusiam.


Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: kama ka enwogha unu site n'ime ka uche-unu buru ihe ọhu, ka unu we nwaputa ihe bu ihe Chineke nāchọ, bú ezi ihe nke di kwa Ya ezi utọ nke zu-kwa-ra okè.


Unu emerela Jehova, bú Chineke-unu, otú a.


unu ahuwo kwa ihe-árú nile ha, na arusi nile ha, bú osisi na nkume na ọla-ọcha na ọla-edo, nke di n'etiti ha:)


Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan