Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:27 - Bible Nso

27 (n'ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n'iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú;)

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:27
14 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Ma o jere ije n'uzọ ndi-eze Israel. Ọzọ kwa, o mere ka nwa-ya nwoke gabiga nime ọku, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Ndi-isi nile nke ndi-nchu-àjà, na ndi Juda, mekpu-kwa-ra ihe-nmekpu ri nne, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di; ha we merua ulo Jehova nke O doro nsọ nime Jerusalem.


Ha we di elu n'obi, me ihe-árú n'irum: M'we wezuga ha mb͕e M'huru ya.


Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.


Dika nkpuru-vine n'ọzara ka M'chọtara Israel; dika nkpuru nke buru uzọ cha n'osisi fig n'oge mbu ya ka M'huru nna-unu-hà: ma ha onwe-ha biakutere Beal-peoa, kewaputa onwe-ha nye ihere ahu, ghọ ihe-árú dika ihe ahu ha huru n'anya.


Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu:


Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:


ka ala ahu we ghara ib͕ọputa unu mb͕e unu nēmeru ya, dika ọ b͕ọputara mba ahu nke di n'iru unu.


ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.


Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa.


N'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu, bu onye ọ bula nēme ihe ndia, onye ọ bula nēme ajọ omume.


Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēme arusi apiri api ma-ọbu arusi awuru awu, bu ihe-árú nke Jehova, ọlu aka nke onye nātu akika, we tiye ya n'ebe nzuzo. Ndi Israel nile gāza kwa, si, Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan