Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:26 - Bible Nso

26 Unu onwe-unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, ghara kwa ime ihe ọ bula nime ihe-árú ndia nile; ma ọ bu onye amuru n'ala, ma-ọbu ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:26
16 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.


I gāsi kwa ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēsure àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ,


ala ahu ru-kwa-ra árú: M'nēwere kwa ajọ emume-ya leta ya, ala ahu nāb͕ọputa kwa ndi bi nime ya.


(n'ihi na ihe-áru ndia nile ka ndikom nke ala ahu meworo, ndi nọ n'iru unu, ala ahu ru-kwa-ra árú;)


Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n'iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.


Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.


Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru.


Ọ buru na unu nāhum n'anya, unu gēdebe ihe nile M'nyere n'iwu.


Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.


Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.


I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan