Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:24 - Bible Nso

24 Unu ewerela ihe ndia nile meru onwe-unu: n'ihi na ewere ihe ndia nile me ka mb͕a nile rua árú, bú ndi Mu onwem nāchupu n'iru unu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “ ‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:24
22 Iomraidhean Croise  

Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.


M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile:


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


Ma mb͕e emere ka ihe ndia gwusia, ndi-isi biarurum nso, si, Ndi Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, ha ekewapughi onwe-ha n'etiti ndi di iche iche nke ala ọzọ, nēme dika ihe-árú-ha si di, bú ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi Jebus, na ndi Amon, na ndi Moab, na ndi Ijipt, na ndi-Amorait.


Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha.


M'we zitere unu ndi-orùm nile, bú ndi-amuma, nēbili n'isi-ututu nēzite ha, si, Biko, unu emela ihe-árú a nke M'kpọworo asì.


Nwa nke madu, mb͕e ulo Israel bi n'elu ala-ha, ha we merua ya site n'uzọ-ha, site kwa n'omume nile ha: dika iru-árú nke nwanyi di na nsọ, otú a ka uzọ-ha diri n'irum.


Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.


Unu gēdebe kwa ihe-ndebem, ka unu we ghara ime ihe ọ bula nime ukpuru ihe-árú ndia, nke anēmeri n'iru unu, ka unu we ghara kwa iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Eme-kwa-la ka ala ahu, nke unu onwe-unu nēbi nime ya, rua árú, nke Mu onwem nēbi n'etiti ya: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, nēbi n'etiti umu Israel.


Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.


Emerela Jehova, bú Chineke-gi, otú a: n'ihi na ihe-árú nile nke Jehova, nke Ọ nākpọ asì, ka ha meworo chi-ha; n'ihi na ọbuná umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha nēsurere chi-ha n'ọku.


N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.


Ekwula n'obi-gi, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, kwapusiri ha n'iru gi, si, N'ihi ezi omumem ka Jehova mere ka m'bata inweta ala nka: ma ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova nānapu ha ala-ha n'iru gi.


Ọ bughi n'ihi ezi omume-gi, ma-ọbu n'ihi nziri-ezi nke obi-gi, ka gi onwe-gi nābà inweta ala-ha: kama ọ bu n'ihi nmebi-iwu nke mba ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi, ka Ọ we me kwa ka okwu ahu guzosie ike nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi, bú Abraham, na Aisak, na Jekob.


ayi gēwere kwa ndikom iri nime ọgu ise nke ebo nile nke Israel, na ọgu ise nime nnù abua na ọgu iri, na nnù abua na ọgu iri nime orú nnù na nnù ise, iwetara ndi Israel ihe-oriri-uzọ, ka ha we me, mb͕e ha biaruru Geba Benjamin, dika ihe-nzuzu nile si di nke ha meworo n'Israel.


Ndi-nwe Gibea we bilie megidem, b͕a ulo buruburu imegidem n'abali; mu ka ha chère ib͕u, ikom nwayi ka ha weda-kwa-ra n'ala, o we nwua.


M'we jide ikom nwayi, bọ̀ ya abọ̀, zisa ya n'ọhia nile nke ala-nketa Israel: n'ihi na ha emewo ihe-nzube ọjọ na ihe-nzuzu n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan