Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Levitikọs 18:20 - Bible Nso

20 Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 “ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Levitikọs 18:20
17 Iomraidhean Croise  

Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.


Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya.


asi na ọ bu onye nērighi ihe n'ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ;


Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


ya na nwoke ọzọ ewe dina ka ọ ra aru n'aru-ya, ewe zopu ihe ahu n'anya di-ya kpuchi kwa ya, nwayi ahu ewe rua árú, ma ọ dighi onye-àmà megide ya, ejideghi kwa nwayi ahu;


gi onye nāsi ka madu ghara ikwa iko, ì nākwa iko? gi onye nākpọ arusi ihe-árú, ì nēzu ihe ulo chi ori?


Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,


Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,


Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'Israel.


Ma ọ buru na nwoke ahu ahuta nwa-ab͕ọghọ ahu n'ọhia, bú nwayi nwoke kwere ilu, nwoke ahu ewe jigide ya n'ike, soro ya dina; ọ bu kwa nání nwoke nke soro ya dina gānwu:


Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan